Psalms 130

Abụ nrigo.

Mkpụrụobi na-ele anya Chineke

1O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa.
2Onyenwe anyị, nụrụ olu m.
Ka ntị gị na-aṅakwa ntị
nʼolu arịrịọ m, maka amara.

3O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile,
Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo?
4Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie dị;
ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi.

5Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya,
ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị.
6Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị
karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ,
e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ.

7Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide,
nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa.
8Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel
site na mmehie ya niile.
Copyright information for IboBIU